Jiri Uche na Agba Mbo

Ahụtara m nwaanyị a dịka onye na-agba nnukwu mbọ ịhụ na ụmụ ya gara akwụkwọ maka itozu ihe e ji mmadụ eme n’ọdịnihu. Ịgba mbọ amaka. Ebumnuche ya mezuoro ya n’aha Jizọs Kraịst…mbọ ya mịtara ya ezi mkpụrụ o!
Mana aghaghị m ikwupụta na obi eruchaghi m ala n’ụdị nkwakọ ọ kwakọrọ ụmụaka asaa n’otu ọgbatumtum were na-agba n’okporoụzọ Naijiria. Echere m na ọ gaara ịka mma na ọ ji ụkwụ kpọga ụmụ ya ndị ahụ n’ụlọakwụkwọ. Ọ bụrụ na ihe ùkè gakwudo ha n’ụzọ, ọ ga-abụ ikpochapụ ezinaụlọ.
Biko nụ, nke a bụkwa uche onye adị ya njọ.
Ndeewo.

Igba Mbo
Igba Mbo

Ihe m hụrụ na foto ahụ bụ onye nne bu ụmụ ya isii n’ọgbatumtum were na-ebuga ha ụlọakwụkwọ. Ọ bụ nne na-agba mbọ. Otu ụbọchị ụmụaka a ga-abụcha ndị ọkaa, dibịa Bekee, ndịnkụzi, ọkaikpe, wdg. Mgbe ahụ, ha ga-esonye n’Ụwandịigbo malite soro kwalitewe asụsụ na omenala Igbo.

Etu a ka m siri hụ ya. Ugbu a, ka m jee kpọọ nne m n’ekwentị nụrụ olu ya maka na nne bụ ihe ukwu.

Ọtụtụ ndị Ọkaa mmụta Igbo ọnụ na-eru n’okwu kọwara ebumnuche ha.
N’uche onye adịghị njọ, nwaanyị a karaaka, bụrụkwa ọgba mbọ. Okwu m agwụ!
Ndewo nụ ụmụigbo!

Comments are closed.