ABỤ ỤTỤTỤ ỌMA

ABỤ ỤTỤTỤ ỌMA
Ụtụtụ ọma nụ ụmụ Chukwu!
Ya dịrị onye ọbụla mma
Ya gaziere ụmụ Chukwu niile
N’aha PILA Chukwu ọma.

Ụtụtụ ọma nụ ụmụnne moo!
Gaa nụ lọta n’udo
Kelee Chukwu odu ndị ije
N’aha PILA Chukwu ọma.

Ụtụtụ ọma nụ ụmụnna moo!
Ya gaziere ndịigbo dum
Ya gaziere ndị Amerịka
N’aha PILA Chukwu ọma.

Ekele ọma gaara ụwa dum
Ya gaziere ndịigbo dum
Ya gaziere ndị Nigeria
N’aha PILA Chukwu ọma.
(Composed & written by KIN 2018)

Comments are closed.