ILU NDỊIGBO

ILU NDỊIGBO

Ịlụ  bụ  ahịrịokwu ndịigbo ji achọ  okwu mma. Ọkaa okwu n’ala Igbo ji ilu eme akpaala okwu. Onye ahụ  ga-abụ ọkpọkọpị n’ịwa okwu Igbo agba.
Lee nụ ahụsa n’ụta.

1. Oke bi n’ụlọ gwara oke bi n’ọhịa n’azụ dị na ngịga.
2. Onye ụlọ ya n’agba ọkụ anaghị achụ oke.
3. Ana esi n’ụlọ mara mma pụọ ama.
4. Okenye anaghị anọ n’ụlọ, ewu amụọ n’ọgbụ.
5. Anam anwụanwụ jere n’ụlọ anwụnyụọm anya.
6. Were ụlọ gị mara ụlọ m.
7. Ndi bi n’ụsọ ụlọ ụka na ekpe azụ abịa ụka.
8. Nwata ụkwụ nje nje ka okenye isi awọ nọ n’ụlọ mara ihe.
9. Onye nọrọ n’ụlọ ya, ọ na-aba.
10. Ụlọ wụ ụlọ mị na gị, ma jiri ọgọdọ nwanyị m mee m eze.
11. Onye ụlọ ya dị n’akụkụ mmiri anaghị eji asụ mmiri akwọ aka.
12. Anaghị eji maka iwe oke esunye ụlọ ọkụ.
13. Ụkọchukwu/Fada anaghị abara onye n’abịghị ụlọ ụka mba.
14. Ụlọ nile n’eshi/n’ehi mmiri.
15. Ejila nkịta ọhịa eche ụlọ ọkụkụ nche.
16. Akụ rou ụlọ, ya akọwaa ebe osi.
17. Ụzọ esi aga n’ụlọ enyi adịghị anya.
18. Otu osisi anaghị ebu ụlọ.
19. Onye ndi iro gbara okirikiri n’eche ụlọ ya nche mgbe ọbụla.
20. Azịza ochie amarala/ma akụkụ ụlọ nile.
21. Onye iberibe dị mma n’obodo ma ọbụghị n’ụlọ m ka ọga esi apụta.
22. Onye ọbụla bụ eze n’ụlọ ya.
23. Anaghi ere okụkọ anya mpi n’ụlọ
24. Dimkpa ụlọ yo dichiri ụzọ ji ụgwọ ekele
25. Nwoke adighi mma inọ na ụlọ ya nọpia mkpụrụ ihe
26. Ogoli anaghi anọ na ụlọ ama ihe zụrụ n’ ahia
28.  Iro ụlọ ka nsị (poison) njọ
28. Ọbi na ilọ mara ada nne ewụ
29. Okwu onye amụma anaghị adị ire na ụlọ nna ya
30. Ụlọ adịghị mma ị bupu n’ezi.
31.  Ọ bụ ire ọjọọ mmadụ imejo/ịkọrọ enyi ya n’ọha bịa n’ụlọ na-arịọ mmezi.
32. Arịrị nwaanyị kaa mma n’ụlọ dị ya.
33. Ebe isi na-adịla, ya rutee ụlọ.
34. Nwata na-amaghị na a na-ekuchi nne ya dị na-eche na a na-arụgharịrị nne ya ụlọ.
35. Mmadụ anaghị a nọrọ n’ụlọ hụụ ihe gbara n’aha.
36. Nwata nna ya nọ ndụ anaghị e nwee azụ ụlọ.
37. Ụlọ nwaanyị mgbagha mgbagha anaghị atụ ọkụ.
38. Okokporo na-ebe akwa na ahịa ejubooghi, ndị nga ya ole nọ n’ahia?
39. Nwata chọọ enyi ya n’ụlọ ha ma ọ hụghị ya, ya a sị na mmadụ anoghi n’ulo.
40. Dimkpa nọkata n’ụlọ, ya erie ihe edowere ụmụntakịrị.
41. Nwa nwe ụlọ lụsiri onye si na be ya a gafee a dọọla ndị ọzọ aka ná ntị.
42. Eluigwe dee gbii, obi a maafuo onye ụlọ ya kara aka.
43. Dibịa ụkpa na-eburucha anụ àjà a laa n’ụlọ ya.
44. Ọkụkọ ụlọ anaghị a haa mmanụ.
45. Ọkụkọ ụlọ bụpuuru ọkụkọ dị n’ámá nri dị n’ụlọ.
46. Anaghị e ree ọkụkọ ụkwụ ọrụ n’ahia ụlọ.
47. Eju nwata bụ n’ọhịa, eju ruo ụlọ, ndị nwee eju eburu ya.
48. Nwoke anaghị a nọọ n’ụlọ ya nọọpịa mkpụrụ amụ.
49. Kaa onye ụlọ ihe a sọọ.
50. Ụlọ mmadụ anaghị adị ya njọ.
51. Nwoke mara etu ụlọ ya dị anaghị e mee sugar ahịa.
52. A mara a ghara ka dị na nwaanyị ji-ebi n’ụlọ.
53. Ọjị ekwesịghị ịkọ na be dike bichiri ụzọ.
54. Ụlọ mmadụ na-aga ka ọ na-eri.
55.  Nkuku gbajie, ụlọ a daa.
56. A na-eme ihe nwaanyị na mkpuke ụlọ.
57. Ma nwaanyị emeghị ihe eboro ya, ya adụọ isi n’ekwu ụlọ ya.
58. Nwa amụrụ n’ụlọ anaghị emeevọ ndị nwe ya.
59. Ọ nwere ihe dị iche na nwaany
60. Nwaanyị tụtaa ime n’ụzọ, ya amụọra ya dị ya n’ụlọ.
61. Nwaanyị a mụrụ n’ụlọ, lụọ n’ụlọ gosiri agwa ọma.
62. Atụrụ cheere na ya na-anyụre ụlọ onye nwe ya amaghị na ọ na-anyụree ike ya.
63. Etu ọgọ jiri jikere ga n’ụlọ ọgọ ya nwaanyị mere ejiri rịọ ya ka ọ nyetu aka sụtụrụ ya nri n’usekwụ.
64. Akaodo nwaanyị bụ egbe na mma ya.
65. Ejiri amamihe rụọ ụlọ, ejiri nghọta hazie ya.
66. Ụlọ agbata obi gi n’agba ọkụ,chekwaa ụlọ gị.
67. Anaghị anọ n’ime ọhịa agụ osisi eji arụ ụlọ.
68. Anaghị echekwa ọkpụkpụ n’ụlọ nkita.
69. Ọchichara rụọ ala, ya ezuo n’ụlọ ọkụkụ.
70. Akpakwala ụlọ gị ọkụ iji gbuo oke.
71. Akwusie dibia ụgwọ, ya abụọ mgbọrọgwụ n’ụlọ arụsị.
72. Ụlọ na-anaghị anabata ndi ọbịa, anaghị anabata ndi mmụọ.
73. Nwoke n’eweghị nwunye enweghị ụlọ.
74. Ụlọ n’agba ọkụ, agadị nwanyị n’achọ iko anwụrụ ya.
75. Onye ọbịa n’abụ onye ishi n’ụlọ onye ọzọ.
76. Mgbawara ụlọ n’anụ ntị.
77. Anya mmiri adighị agba n’ụlọ onye nzuzu.
78. Ihere n’eme ụlọ nnekwu ọkụkụ kwara akwa.
79. Otu ụlọ nwe ọkụkụ ma ọha nwe mkpu/olu mkpu ya.
80. Otu akịrịka ụlọ pụọ n’elu ụlọ akịrịrka, ọgaghị eshi/ehi mmiri.
81.  Onye ụlọ ya n’agba ọkụ agaghị ahọ ndi g’enyere ya aka emenyụ ọkụ.
82. Anaghị ezo ahụrọkụ oge ụlọ n’agba ọkụ.
83. Ndi mbibi dịka nkịta nọ n’ụlọ ọnwụ.
84. Nwata nwe ọkụkụ nọ n’ụlọ ma onye nwe ọkụkụ g’apụta ma egbuo ọkụkụ.
85. Mata ndi agbata obi gi tupu ị zụọ ụlọ.
86. Onye kpaa nkụ ahụhụ,ngwere abịa oriri n’ụlọ ya.
87. Onye gbara ụlọ ya ọkụ, ma ahụhụ dị na ntụ.
88. Ọbụ n’ụlọ onye iberibe/nzuzu ka ndi mmadụ n’atụ aka n’ili onye agha ụnyịahụ.
89. Na agbanyeghị oteka/anya ị nọ n’ụlọ gị,ị ga n’aga ruo oge ị laruru ụlọ gị.
90. Ụlọ bụ maka njem ma ili bụ ebighiebi.
91. Ụlọ g’ewepụta ihe ozuru.
92. Onye na-anaghị abịa n’ụlọ gị achọghị gị n’ụlọ ya.
93. Ezi nwanyị bụ okpu eze ezi nq ụlọ ya
94. Anaghị eji otu ibe ụlọ achọ ụlọ mma.
95. Ụlọ chere sị ọbụ nanị ya ka-ana ekpufe ekpufe, abaa n’ọhịa ekpufee osisi apali.

Lee nụ ilu ụfọdụ na nkọwa ya na bekee:
Ilu/Proverb – Otu mkpụrụ akwụ adịghị efu n’ọkụ
Literal meaning – One nut does not miss in the fire.
Real meaning – The fewer things we have the more careful we are about them.

Ilu/ Proverb – Ihere adịghị eme onye ara ka ọ mere ụmụ-nna ya
Literal meaning – A mad person is not as ashamed as his relatives.
Real meaning – People who know values appreciate them most. Relations are concerned most with a person’s behaviour.

Ilu/ Proverb – Otu onye tụọ izu, o gbue ọchụ
Literal meaning – If one man takes decision, he commits murder.
Real meaning – Knowledge is never complete: two heads are better than one.

Ilu/ Proverb – Ihe ehi hụrụ gbalaba ọsọ ka ọkụkụ hụrụ na-atụ ọnụ
Equivalent English meaning – Fools rush in where angels fear to tread.

Ilu/ Proverb – Oge adịghị eche mmadụ
Equivalent English meaning – Time and tide wait for nobody.

Ilu/ Proverb – Kpo ahịhịa ka obere otu ụkpa
Equivalent English meaning – A stitch in time saves nine.

Ilu Proverb – Chọọ ewu ojii ka chi dị
Equivalent English meaning – Make hay while the sun shines

Ilu/ Proverb – Gidi gidi bụ ugwu eze
Equivalent English meaning – Unity is Power

Comments are closed.